Work

Mgbamonwe Olundị n’Igbo (Dialect Variation in Igbo)

Year: 2019
Type: article
Abstract: Igbo Nchọcha a lebara anya na mgbamonwe n’olundị ndị Igbo n’ogo ụda na okwu na mpaghara Ụrata, Mbieri, na Ọhaọzara Igbo. Ọtụtụ ndị amụmamụ na sayensi asụsụ na-ekwu na asụsụ kwụ ̀ chị̀m, na ọ anaghị agbaonwe nke ọ na-agbanwe agbanwe. Ọzọkwa, ndị Igbo ụfọdụ anaghị aghọtami okwu na mkpụụdaasụsụ Igbo ụfọdụ sitere n’olundị ndị Igbo bidebere n’oke ala Igbo na obodo ndị ọzọ. Ọnọdụ a mere anyị ji họrọ olundị ndị Ụrata, Mbieri, na Ọhaọzara bụ ndị ha na obodo ọzọ gasị gbara agbataobi. Anyị chọrọ igosi na usoro asụsụ na-agbanwe agbanwe ọ kacha n’ogo ụda na okwu. Ya mere nchọcha a ji gbado ụkwụ n’inyocha mgbamonwe n’ogo ụda na okwu n’Olundị ndị Igbo. E ji atụtụ soshiolingwistiks wee mee nchọcha a. E ji ajụjụ ọnụ na nọrọ lere wee nakọta ngwa nchọcha site n’aka ndị ntorobia na ndị okenye Ụrata, Mbieri, na Ọhaọzra na-asụ asụsụ epum ha. E gosiri ihe a nakọtara na tabuul, kọwasịa ha ma hazie ha nke ọma. A chọpụtara na e nwere ọtụtụ mgbamonwe asụsụ n’olundị anyị nyochara. Mgbamonwe n’olundị ndị a na-ebute adịmiche na mkpọpụta nakwa ndeputa ụda na mkpụrụokwu mana mpụtara ha na-abụ otu ihe. A chọpụtakwa na ihe na-ebutekarị mgbamonwe asụsụ gunyere mbịakọta asụsụ, mpaghara ebe ndị bi, ogo agụmakwụkwọ, ọrụaka, na ogo ọpụpụ na mbata. English The focus of this research is on dialect variation in Igbo from phonological and lexical levels in Ụrata, Mbieri, and Ọhaọzara dialects of the Igbo language. The research aims also to challenge the linguistic theories that model dialect/language as a static entity, identifying homogeneity with structure. Further, earlier researchers have not focused proper attention on dialect variation on Igbo especially on Ụrata, Mbieri, and Ọhaọzara. Further, some Igbo speakers often do not understand some Igbo phonemes and lexis in different dialects of Igbo especially of those living at the border. This situation underlies our choice of Ụrata, Mbieri, and Ọhaọzara that are have borders with other non Igbo communities. Data for the study is through unstructured oral interview and participant observation from the indigenous speakers of Ụrata, Mbieri, and Ọhaọzara. The data were presented in tables and analysed discriptivley. The result reveals different kinds of dialect variation in Ụrata, Mbieri, and Ọhaọzara Igbo at the phonological and lexical levels of linguistics descriptions. The study reveals also that phonological and lexical items can be realised differently by different speakers or by the same speaker in different contexts but the meaning remains constant. The study shows also that language is not static but heterogeneous and varies.
Language: English
Open Access status: bronze
OpenAlex ID: W7220615652
FWCI:
Cites:
Cited by:
Related to: 10